Judges 4:15-24

15Mgbe ahụ, Onyenwe anyị jiri mma agha ya chụsaa Sisera na ndị agha ya na ụgbọ agha igwe ha nʼihu Barak. Sisera nʼonwe ya hapụrụ ụgbọ agha ya jiri ụkwụ gbapụ ọsọ.

16Barak na ndị agha ya chụrụ ndị agha ahụ ọsọ, ha na ụgbọ agha igwe ha niile, chụruo ha Haroshet Hagoyim. Ha ji mma agha tigbuo ndị agha Sisera niile. Ọ dịkwaghị otu onye nʼime ha fọdụrụ ndụ. 17Ma Sisera gbapụrụ ọsọ gaa zoo onwe ya nʼụlọ ikwu Jael, nwunye Heba, onye Ken. Nʼihi udo dị nʼetiti eze Jabin, onye Hazọ, na ndị ezinaụlọ Heba, onye Ken.

18Jael pụrụ ije zute Sisera sị ya, “Bịa Onyenwe m, bakwute m. Atụla ụjọ.” Ya mere na ọ bara nʼime ụlọ ikwu ya, o weere akwa ịchụ oyi kpuchie ya.

19Mgbe ahụ, ọ sịrị ya, “Akpịrị na-akpọ m nkụ, nyetụ m mmiri ka m ṅụọ.” O meghere karama akpụkpọ mmiri ara ehi, nye ya ihe ọṅụṅụ, jirikwa akwa ahụ sachie ya.

20Sisera gwara nwanyị ahụ bụ Jael okwu sị, “Guzo nʼọnụ ụzọ ụlọ a. Ọ bụrụ na onye ọbụla abịa jụọ gị, ‘O nwere onye gbabatara nʼebe a?’ sị ya, ‘Mba.’ ”

21Ike gwụrụ nnọọ Sisera. Mgbe ahụ, ọ malitere ịrahụ ụra, Jael, nwunye Heba, wepụtara otu ǹtu e ji a kpọgide ụlọ ikwu ahụ nʼala, werekwa mkpirisi igwe nʼaka ya. O jiri nwayọọ jekwuuru Sisera ebe o dina na-arahụ ụra, kpọọ ya ǹtu ahụ nʼegedege ihu ya. Otu a ka Sisera si nwụọ.

22Mgbe Barak bịara ịchọ Sisera, Jael jekwuru ya sị, “Bịa ka m gosi gị nwoke ahụ ị na-achọ.” Barak sooro ya jee, ma lee, Sisera anwụọlarị site na ǹtu ahụ a kpọrọ ya nʼisi.

23Nʼụbọchị ahụ, Chineke meriri Jabin, eze ndị Kenan nʼihu ụmụ Izrel. 24Aka ụmụ Izrel bụ nke dị ike na-adịkwa ike nke ukwu megide Jabin bụ eze Kenan ruo mgbe ha lara ya nʼiyi.

Copyright information for IboBIU